Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 150 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

1Toonu Onyenwe anyị.Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3Werenụ opi ike too ya,werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5werenụ ogene too ya,werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.Toonu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]