Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isaiah 12 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Otuto

1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,“Aga m eto gị Onyenwe anyị.Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,ma ugbu a, iwe gị adajụọla;ị kasịkwara m obi.

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”

3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmirisite nʼolulu mmiri nke nzọpụta.

4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya;meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ;kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.

5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.

6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]