Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Job 25 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Okwu Bildad

1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:

2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.

3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?

4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?

5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,

6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,mmadụ, nke bụ naanị idide.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]