Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 6 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.

2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.

3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?

4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.

5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.

7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.Ọ nabatala ekpere m.

10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]