Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 142 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere.

Ekpere nke onye mkpọrọ

1Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa;ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.

2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.

3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,ọ bụ gị maara ụzọ m.Nʼụzọ ebe m na-esi agaka ndị mmadụ siiri m ọnya.

4Lee anya nʼaka nri m ma hụna ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.Enweghị m ebe mgbaba.Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.

5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,oke m nʼala ndị dị ndụ.”

6Gee ntị na mkpu akwa m,nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,nʼihi na ha siri ike karịa m.

7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,ka m nwee ike too aha gị.Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburunʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]