Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 11 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Onyenwe anyị ebe mgbaba

1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”

2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?

4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.

6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omumedịka mmiri ozuzo;oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]