Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 1 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Onye ihe na-agara nke ọma

1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehiemaọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.

2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,

3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.Ha dị ka igbugbo ọkanke oke ifufe na-efesasị.

5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.

6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]