Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 3 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela

3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5Edinara m ala, hie ụra,ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,agaghị m atụ egwu ọbụla.

7Bilie Onyenwe anyị!Zọpụta m Chineke m!Tie ndị iro m niile aka nʼagba;tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.

8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]