Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 13 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Ekpere maka nnapụta

1Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?

2Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgbanọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?

3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;

4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.

6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]