Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 140 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka nchebe

1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.

2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi hana-akpali agha ụbọchị niile.

3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela

4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,ndị na-eche echiche ọdịda m.

5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela

6A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.

7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.

8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela

9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na ngangaka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.

10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.

11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.

12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenyena-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.

13Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]