Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 139 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Chineke maara ihe niile

1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,ị makwaara m nke ọma

2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.

3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;ị mazukwara ụzọ m niile.

4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwutupu m kwuo ya.

5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,ị tụkwasịla m aka gị.

6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.

7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?

8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.

9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaanʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,

10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu maka nri gị ga-ejidesi m ike.

11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi mìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”

12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;ọrụ gị niile dị ebube;amaara m nke a nke ọma.

15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọmgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gịtupu otu nʼime ha adịrị.

17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!Leekwa ka ha si dị ukwuu.

18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!

20Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.

21O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?

22Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.

23O Chineke, nyochaa m, mara obi m.Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.

24Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]