Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonah 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then Jonah prayed to our Father from inside the fish: Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.
2 In my distress I called to my Father, and he answered me; from the grave's belly I cried for help, and you heard my voice. Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m.
3 You hurled me into the deep, into the heart of the seas, and the currents swirled around me; all your breakers and your waves swept over me. Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
4 Then I said, 'I have been driven away from your sight; yet I will look again toward your holy temple.' Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
5 The waters closed in over me to the point of death; the deep surrounded me; seaweed was wrapped around my head. Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
6 I sank down to the roots of the mountains; the earth shut its gates behind me forever. But you brought my life up from the pit, my Father. Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
7 As my life was ebbing away, I remembered my Father, and my prayer rose to you, to your holy temple. “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
8 Those who cling to worthless idols walk away from the love that could be theirs. “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
9 But I will sacrifice to you with grateful praise; I will keep every vow I have made. Salvation belongs to our Father! Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”
10 Then our Father spoke to the fish, and it vomited Jonah out onto the dry land. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]