Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonah 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now the word of our Father came to Jonah son of Amittai: Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị,
2 "Get up, go to Nineveh, that great city, and cry out against it, for their evil has risen before me." “Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.”
3 But Jonah set out to flee to Tarshish, away from our Father's presence. He went down to Joppa, found a ship bound for Tarshish, paid its fare, and boarded to go with them to Tarshish, away from our Father's presence. Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu Onyenwe anyị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu Onyenwe anyị.
4 Then our Father hurled a great wind at the sea; a violent storm arose, and the ship seemed about to break apart. Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ.
5 The sailors were terrified, each crying to his own god. They threw the ship's cargo into the sea to lighten it. But Jonah had gone below deck, where he lay fast asleep. Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
6 The captain came and said, "How can you sleep? Get up, call on your god! Maybe he will notice us, and we won't perish." Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.”
7 The men said to each other, "Come, let's cast lots to find who's to blame for this disaster on us." They cast lots, and it fell on Jonah. Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona.
8 They said to him, "Tell us—you who have brought this disaster on us—what do you do? Where do you come from? What is your country? What people are you from?" Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”
9 He answered, "I am a Hebrew, and I fear our Father, the Father of heaven, who made the sea and the dry land." Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.”
10 Then the men were terrified and said, "What have you done?" For they knew he was fleeing from our Father's presence, because he had told them. Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị.
11 Then they said to him, "What should we do to you to calm the sea for us?"—for the sea grew stormier and stormier. Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?”
12 He told them, "Lift me up and throw me into the sea, and it will calm for you. I know this great storm came on you because of me." Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.”
13 Instead the men rowed hard to reach land, but could not, for the sea grew wilder and wilder against them. Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ.
14 So they cried out to our Father: "Please, God, don't let us die for taking this man's life. Don't hold us guilty of innocent blood, for you have done as you pleased." Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.”
15 Then they picked Jonah up and hurled him into the sea, and the raging sea grew calm. Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara.
16 The men then feared our Father greatly, offered a sacrifice to our Father, and made vows. Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche.
17 Now our Father appointed a great fish to swallow Jonah, and Jonah was in the belly of the fish three days and three nights. Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]