Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obadiah 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The vision of Obadiah. This is what the Sovereign Father says about Edom: We have heard a message from our Father, and an envoy sent among the nations—"Rise up! Let us rise against her for battle!" Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”
2 Look, I will make you small among the nations; you will be utterly despised. “Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.
3 The pride of your heart has deceived you, you who live in the clefts of the rock, whose home is the heights, who say to yourself, "Who can bring me down to the ground?" Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
4 Though you soar like the eagle, though you set your nest among the stars, from there I will bring you down, declares our Father. A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5 If thieves came to you, if plunderers came by night—how you have been destroyed!—wouldn't they steal only what they wanted? If grape-pickers came to you, wouldn't they leave some grapes behind? “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
6 How Esau has been ransacked, his hidden treasures plundered! Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
7 All your allies have driven you to the border; those who were at peace with you have deceived you and overpowered you; those who shared your table have set a trap beneath you—and you don't even see it. Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.
8 Will I not on that day, declares our Father, destroy the wise men of Edom and wipe out understanding from the mountain of Esau? “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
9 Your warriors will be shattered, Teman, so that everyone on the mountain of Esau will be cut down in the slaughter. Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.
10 Because of the violence you did to your brother Jacob, shame will cover you, and you will be cut off forever. Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
11 On the day you stood by and did nothing, on the day strangers carried off his wealth and foreigners entered his gates and cast lots for Jerusalem—you too were like one of them. Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
12 But do not gloat over your brother in the day of his misfortune; do not rejoice over the people of Judah in the day of their ruin; do not boast loudly in the day of distress. Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.
13 Do not enter the gate of my people in the day of their calamity; you of all people, do not gloat over his disaster in the day of his calamity; do not loot his wealth in the day of his calamity. I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.
14 Do not stand at the crossroads to cut down his fugitives; do not hand over his survivors in the day of distress. I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.
15 For the day of our Father is near for all the nations. As you have done, it will be done to you; your deeds will come back on your own head. “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso nye mba niile. Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị; ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
16 For as you drank on my holy mountain, so all the nations will drink continually; they will drink and swallow and become as though they had never been. Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị. Ha ga-aṅụ, ṅụọ, ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.
17 But on Mount Zion there will be deliverance, and it will be holy, and the house of Jacob will possess their inheritance. Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
18 The house of Jacob will be a fire and the house of Joseph a flame, and the house of Esau will be stubble; they will burn it and consume it, and there will be no survivor of the house of Esau, for our Father has spoken. Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
19 Those of the Negev will possess the mountain of Esau, and those of the foothills the land of the Philistines; they will possess the land of Ephraim and the land of Samaria, and Benjamin will possess Gilead. Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
20 The exiles of this army of the people of Israel will possess the land of the Canaanites as far as Zarephath, and the exiles of Jerusalem who are in Sepharad will possess the cities of the Negev. Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.
21 Deliverers will go up to Mount Zion to rule the mountain of Esau, and the kingdom will belong to our Father. Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn maka ịchị ugwu Ịsọ niile. Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]