Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonah 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then the word of our Father came to Jonah a second time: Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị,
2 "Get up, go to Nineveh, that great city, and proclaim the message I give you." “Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.”
3 So Jonah got up and went to Nineveh, as our Father had said. Nineveh was a huge city—three days to cross. Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu.
4 Jonah walked one day into the city and cried out, "Forty more days and Nineveh is overturned!" Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.”
5 The people of Nineveh believed God. They called a fast and put on sackcloth, from the greatest to the least. Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe.
6 When the news reached Nineveh's king, he rose from his throne, removed his robe, covered himself with sackcloth, and sat in ashes. Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ.
7 He had this proclaimed in Nineveh, by decree of the king and his nobles: No person or animal, herd or flock, may taste anything; they must not graze or drink water. Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri.
8 Let people and animals be covered with sackcloth, and everyone cry out to God with all their strength. Let each turn from his evil way and the violence in his hands. Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa.
9 Who knows? God may turn and change his mind, turn from his fierce anger, so we're not destroyed. Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.”
10 When God saw their deeds—that they turned from their evil way—God changed his mind about the disaster he had threatened to bring on them, and did not do it. Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]