Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonah 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But this upset Jonah deeply, and he burned with anger. Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ.
2 He prayed to our Father, "Please, O Father, isn't this what I said while still in my own land? That's why I fled toward Tarshish first—I knew you are a gracious, compassionate Father, slow to anger, overflowing with covenant love, one who relents from sending disaster. Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.
3 Now, our Father, please take my life from me—death is better for me than life." Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”
4 And our Father said, "Is it right for you to be so angry?" Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”
5 Jonah left the city and sat east of it, made himself a shelter there, and sat under it in the shade, waiting to see what would happen to the city. Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ.
6 And our Father appointed a plant and made it grow up over Jonah, to shade his head and ease his discomfort. So Jonah was overjoyed because of the plant. Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ.
7 At dawn the next day, our Father appointed a worm that attacked the plant, and it withered. Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.
8 When the sun rose, our Father sent a scorching east wind; the sun beat on Jonah's head until he grew faint. He begged to die: "Better for me to die than to live." O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”
9 But our Father asked Jonah, "Is it right for you to be angry about the plant?" He said, "It is right—angry enough to die." Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”
10 And our Father said, "You pitied the plant you did not work for or grow, which sprouted in a night and died in a night. Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị.
11 And should I not pity Nineveh, that great city, in which there are more than 120,000 people who cannot tell their right hand from their left, and many animals as well?" Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]