Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Micah 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The word of our Father to Micah of Moresheth in the days of Jotham, Ahaz, and Hezekiah, kings of Judah—what he saw about Samaria and Jerusalem. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem.
2 Hear, all you peoples; listen, earth, and all that fills it—let the Sovereign Father be a witness against you, the Sovereign Father from his holy temple. Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
3 For look—our Father is coming out from his place; he will come down and tread on the high places of the earth. Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.
4 The mountains will melt beneath him, and the valleys will split apart, like wax before the fire, like waters poured down a steep slope. Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
5 All this is because Jacob rebelled and the house of Israel sinned. What is Jacob's rebellion? Isn't it Samaria? And what is Judah's high place? Isn't it Jerusalem? Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?
6 So I will make Samaria a heap of ruins in the open field, a place for planting vineyards. I will pour her stones down into the valley and lay bare her foundations. “Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị. Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
7 All her carved images will be shattered, all her wages burned in the fire; all her idols I will lay waste. For from a prostitute's wages she gathered them, and to a prostitute's wages they will return. Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”
8 Because of this I will lament and wail; I will go stripped and naked. I will howl like jackals and moan like ostriches. Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
9 For her wound is incurable; it has come all the way to Judah. It has reached the gate of my people, all the way to Jerusalem. Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta, o rutela na Juda. O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m, rukwaarị Jerusalem.
10 Do not tell it in Gath; do not weep at all. In Beth-le-aphrah roll yourselves in the dust. Unu ekwutela okwu ya na Gat; unu akwakwala akwa ọbụla. Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu, unu ndị Bet-Ofra.
11 Pass on your way, you who live in Shaphir, in nakedness and shame. Those who live in Zaanan do not come out; the wailing of Beth-ezel leaves you with no place to stand. Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
12 For those who live in Maroth wait anxiously for good, because disaster has come down from our Father to the gate of Jerusalem. Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
13 Harness the horses to the chariot, you who live in Lachish. She was the beginning of sin to the daughter of Zion, for in you the rebellions of Israel were found. Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
14 Therefore you will give parting gifts to Moresheth-gath; the houses of Achzib will be a deception to the kings of Israel. Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
15 Once more I will bring a conqueror against you, you who live in Mareshah; the glory of Israel will come to Adullam. Aga m akpọbata onye ga-emeri unu ndị bi na Maresha nʼagha. Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel ga-agbabanye nʼAdulam.
16 Shave your head and cut off your hair for the children you love; make yourself as bald as the eagle, for they will go from you into exile. Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu, meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele, nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]