Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Micah 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Woe to those who plot wickedness and work out evil upon their beds! At the morning light they carry it out, because they have the power to do it. Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.
2 They covet fields and seize them, and houses, and carry them off. They oppress a man and his house, a person and his inheritance. Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.
3 Therefore this is what our Father says: Look, against this family I am devising disaster, from which you cannot pull your necks free; you will not be able to hold your heads high, for it is an evil time. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.
4 In that day they will take up a taunt against you and wail with bitter lamentation, saying, "We are utterly ruined! He trades away the portion of my people; how he strips it from me! To the traitor he parcels out our fields." Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”
5 Therefore you will have no one to cast the measuring line by lot in the assembly of our Father. Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
6 "Do not preach!" they preach. "No one should preach such things; disgrace will not overtake us." Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”
7 Should this be said, house of Jacob? Is the Spirit of our Father impatient? Are these his deeds? Do not my words bring good to the one who walks uprightly? Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?
8 But lately my children have risen up as an enemy. You strip the rich robe from those who pass by unsuspecting, like men returning from war who wanted no fight. Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.
9 You drive the women of my people out of their pleasant homes; from their little children you take away my splendor forever. Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi.
10 Get up and go, for this is no place of rest; because it is defiled, it brings destruction—a grievous destruction. Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.
11 If a man who lives by empty deceit were to lie, "I will preach to you of wine and alcohol," he would be just the preacher for this people! Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.
12 I will surely gather all of you, Jacob; I will surely bring together the remnant of Israel. I will set them as one, like sheep in a pen, like a flock in the midst of their pasture—a place loud with people. “Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.
13 The one who breaks open the way goes up before them; they break through and pass the gate, going out through it. Their King goes on ahead of them, our Father at their head. Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]