Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Micah 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then I said: Listen, leaders of Jacob, rulers of the house of Israel! Isn't knowing justice your duty? Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi
2 You who hate good and love evil, who tear the skin from my people and their flesh from their bones; unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.
3 who eat the flesh of my people, strip off their skin, and break their bones in pieces; who chop them up like meat for the pot, like flesh inside the cauldron. Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”
4 Then they will cry out to our Father, but he will not answer them; he will hide his face from them at that time, because of the evil they have done. Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.
5 This is what our Father says about the prophets who lead my people astray: when they are fed, they cry "Peace," but declare war on anyone who puts nothing in their mouths. Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.
6 Therefore night will come over you, without vision; darkness for you, without divination. The sun will set on the prophets, and the day will go dark over them. Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ; ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla. Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ, ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.
7 The seers will be ashamed and the diviners disgraced; they will all cover their mouths in shame, for there is no answer from our Father. Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”
8 But as for me, I am filled with power—with the Spirit of our Father—and with justice and might, to declare to Jacob his rebellion and to Israel his sin. Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike, ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị, jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi, na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya, na nye Izrel mmehie ya.
9 Hear this, you leaders of the house of Jacob and rulers of the house of Israel, who despise justice and pervert everything that is right, Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb, na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel. Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.
10 who build Zion with bloodshed and Jerusalem with wrongdoing. Ndị ji ọbara wuo Zayọn, werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.
11 Her leaders judge for a bribe, her priests teach for a price, and her prophets divine for silver; yet they lean on our Father and say, "Is not our Father among us? No disaster can come upon us." Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”
12 Therefore because of you Zion will be plowed like a field, Jerusalem will become a heap of ruins, and the temple mount a forested hilltop. Ọ bụ nʼihi gị ka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi, Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]