Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonah 2 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2Ọ sịrị,“Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,ọ zakwara m.Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,ị nụkwara olu akwa m.

3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,nʼetiti oke osimiri.Osimiri dịkwa m gburugburu,ebili mmiri gị na mmali mmiri gịgabigakwara m nʼisi.

4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gịchụpụ m;ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọnʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’

5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,ogbu mmiri na-erikpu m.Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.

6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,e chetara m gị Onyenwe anyị,ma ekpere m bịakwutere gị,nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,na-agbakụta ebere Chineke azụ.

9Ma ọ bụ olu abụ ekeleka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”

10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]