Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Whoever isolates himself pursues his own desire; he lashes out against all sound wisdom. Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
2 A fool takes no pleasure in understanding, but only in airing his own opinions. Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
3 When wickedness comes, contempt comes too, and with dishonor comes reproach. Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
4 The words of a person's mouth are deep waters; the fountain of wisdom is a flowing stream. Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
5 It is not good to show partiality to the wicked, denying justice to the righteous. Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
6 A fool's lips bring strife, and his mouth invites a beating. Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
7 A fool's mouth is his ruin, and his lips are a snare to his soul. Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
8 The words of a gossip are like choice morsels; they go down into the inmost being. Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
9 Whoever is slack in his work is brother to one who destroys. Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
10 The name of our Father is a strong tower; the righteous runs into it and is safe. Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
11 A rich man's wealth is his fortified city; in his imagination it is like a high wall. Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
12 Before destruction the human heart is proud, but humility comes before honor. Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
13 If one answers before he listens, it is his foolishness and his shame. Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
14 A person's spirit can sustain him through sickness, but a crushed spirit—who can bear it? Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
15 The discerning heart acquires knowledge, and the ear of the wise seeks it out. Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
16 A person's gift opens the way for him and brings him before important people. Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
17 The first to state his case seems right, until another comes and examines him. Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
18 Casting the lot settles disputes and separates strong opponents. Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
19 An offended brother is harder to win than a fortified city, and disputes are like the bars of a fortress. Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
20 From the fruit of a person's mouth his stomach is satisfied; with the yield of his lips he is filled. Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
21 Death and life are in the power of the tongue, and those who love it will eat its fruit. Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
22 He who finds a wife finds what is good and receives favor from our Father. Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
23 The poor person pleads for mercy, but the rich answers harshly. Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
24 A man of many companions may come to ruin, but there is a friend who sticks closer than a brother. Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]