Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Better is a poor person who walks in his integrity than one whose words are crooked and is a fool. Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
2 Also, desire without knowledge is not good, and whoever acts in haste misses the way. Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
3 A person's own foolishness ruins his way, yet his heart rages against our Father. Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
4 Wealth adds many friends, but the poor is separated from his friend. Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5 A false witness will not go unpunished, and one who breathes out lies will not escape. Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
6 Many seek the favor of a generous person, and everyone is a friend to one who gives gifts. Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
7 All the brothers of a poor person hate him; how much more do his friends keep far from him! He calls after them, but they are gone. Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
8 Whoever gets wisdom loves his own soul; whoever guards understanding will find good. Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
9 A false witness will not go unpunished, and one who breathes out lies will perish. Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
10 Luxury is not fitting for a fool—much less for a servant to rule over princes. Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
11 The good sense of a person makes him slow to anger, and it is his glory to overlook an offense. Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
12 A king's wrath is like the roaring of a lion, but his favor is like dew on the grass. Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
13 A foolish son is ruin to his father, and a wife's quarreling is a continual dripping. Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
14 House and wealth are an inheritance from one's ancestors, but a prudent wife is from our Father. Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
15 Laziness casts into deep sleep, and an idle person will go hungry. Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
16 Whoever keeps the commandment keeps his life; whoever despises his ways will die. Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
17 Whoever is generous to the poor lends to our Father, and our Father will repay him for his deed. Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
18 Discipline your son while there is hope, and do not set your heart on his destruction. Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
19 A person of great wrath must pay the penalty; for if you rescue him, you will only have to do it again. Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
20 Listen to counsel and accept discipline, that you may gain wisdom in the days to come. Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
21 Many are the plans in a person's heart, but it is the counsel of our Father that will stand. Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
22 What is desired in a person is covenant love, and a poor person is better than a liar. Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
23 The fear of our Father leads to life, and whoever has it rests satisfied, untouched by harm. Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
24 The sluggard buries his hand in the dish and will not even bring it back to his mouth. Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
25 Strike a mocker, and the simple will learn prudence; reprove a person of understanding, and he will gain knowledge. Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
26 Whoever does violence to his father and drives away his mother is a son who brings shame and disgrace. Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
27 Stop listening to instruction, my son, and you will stray from the words of knowledge. Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
28 A worthless witness mocks at justice, and the mouth of the wicked gulps down wickedness. Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
29 Punishment is prepared for mockers, and beatings for the backs of fools. Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]