Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Wine is a mocker, strong drink a brawler, and whoever staggers under it is not wise. Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
2 The terror of a king is like the growl of a lion; whoever provokes him to anger forfeits his own life. Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
3 It is an honor for a person to keep clear of strife, but every fool is quick to quarrel. Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
4 A lazy person will not plow in autumn; so at harvest he looks for a crop and finds nothing. Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
5 The purposes of a person's heart are deep waters, but one who has understanding draws them out. Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
6 Many a person proclaims his own loyal love, but a faithful one—who can find? Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
7 The righteous walk in their integrity; blessed are their children after them! Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
8 A king seated on the throne of judgment winnows out all evil with his eyes. Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
9 Who can say, "I have kept my heart pure; I am cleansed from my sin"? Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
10 Unequal weights and unequal measures—our Father detests them both. Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
11 Even a child is known by his actions, by whether his conduct is pure and upright. Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
12 The hearing ear and the seeing eye—our Father made them both. Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
13 Do not love sleep, or you will grow poor; open your eyes, and you will have plenty of bread. Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
14 "Worthless, worthless!" says the buyer—then off he goes and boasts of his bargain. “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
15 There is gold and an abundance of jewels, but lips that speak knowledge are a rare treasure. Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
16 Take the garment of one who puts up security for a stranger; hold it as a pledge when he does so for foreigners. Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
17 Bread gained by deceit tastes sweet, but afterward the mouth is full of gravel. Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
18 Plans are established by counsel; so wage war only with wise guidance. Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
19 A gossip betrays a confidence; so do not keep company with a babbler. Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
20 Whoever curses his father or mother—his lamp will be snuffed out in deepest darkness. Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
21 An inheritance gained too quickly at the start will not be blessed in the end. Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
22 Do not say, "I will pay back evil for evil." Wait for our Father, and he will deliver you. A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
23 Our Father detests unequal weights, and dishonest scales are no good. Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
24 A person's steps are directed by our Father; how then can anyone understand his own way? Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
25 It is a trap to rashly dedicate something and only later reconsider the vow. Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
26 A wise king winnows out the wicked and drives the threshing wheel over them. Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
27 The human spirit is the lamp of our Father, searching every inmost part. Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
28 Loyal love and faithfulness preserve a king; by loyal love his throne is upheld. Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
29 The glory of the young is their strength, but the splendor of the old is gray hair. Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
30 Wounding blows scrub away evil, and beatings cleanse the inmost parts. Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]