Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The king's heart is a stream of water in our Father's hand; he turns it wherever he pleases. Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.
2 Every way of a person seems right in their own eyes, but our Father weighs the heart. Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.
3 To do what is right and just is more pleasing to our Father than sacrifice. Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.
4 Haughty eyes and a proud heart—the lamp of the wicked—are sin. Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.
5 The plans of the diligent lead surely to abundance, but all who are hasty end up in poverty. Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.
6 Making a fortune by a lying tongue is a fleeting vapor, a deadly trap. Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.
7 The violence of the wicked will drag them away, because they refuse to do what is just. Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi.
8 The way of the guilty is crooked, but the conduct of the pure is upright. Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi.
9 Better to live in a corner of the roof than in a shared house with a quarrelsome wife. Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
10 The soul of the wicked craves evil; their neighbor finds no mercy in their eyes. Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere.
11 When a mocker is punished, the simple grow wise; when the wise are instructed, they gain knowledge. Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma.
12 Our Father, the Righteous One, observes the house of the wicked and brings the wicked to ruin. Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi.
13 Whoever shuts their ears to the cry of the poor will also cry out and not be answered. Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya.
14 A gift given in secret soothes anger, and a bribe slipped into the cloak calms strong wrath. Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ.
15 When justice is done, it is a joy to the righteous but terror to those who do evil. Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe.
16 A person who strays from the way of understanding will rest in the assembly of the dead. Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ.
17 Whoever loves pleasure will become poor; whoever loves wine and oil will never grow rich. Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ.
18 The wicked become a ransom for the righteous, and the treacherous for the upright. Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi.
19 Better to live in a desert land than with a quarrelsome and complaining wife. Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.
20 Precious treasure and oil are in the home of the wise, but a fool devours all he has. Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya.
21 Whoever pursues righteousness and faithful love will find life, righteousness, and honor. Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.
22 A wise person scales the city of the mighty and brings down the stronghold they trust in. Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike, kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha.
23 Whoever guards their mouth and tongue keeps themselves out of trouble. Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.
24 "Mocker" is the name of the proud and arrogant who acts with outrageous insolence. Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile.
25 The craving of a lazy person kills him, for his hands refuse to work. Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
26 All day long the craving grows, but the righteous give and do not hold back. Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.
27 The sacrifice of the wicked is detestable—how much more when brought with evil intent. Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.
28 A false witness will perish, but whoever listens will testify with lasting effect. Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi.
29 The wicked put on a bold face, but the upright give thought to their ways. Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile.
30 There is no wisdom, no understanding, no counsel that can stand against our Father. O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.
31 The horse is made ready for the day of battle, but victory belongs to our Father. E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]