Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A good name is to be chosen rather than great riches, and favor is better than silver or gold. Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
2 The rich and the poor meet together; our Father is the Maker of them all. Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.
3 The prudent sees danger and takes cover, but the simple keep going and pay the price. Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
4 The reward for humility and the fear of our Father is riches and honor and life. Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
5 Thorns and snares lie in the path of the crooked; whoever guards his soul stays far from them. Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
6 Train up a child in the way he should go, and even when he is old he will not depart from it. Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
7 The rich rules over the poor, and the borrower is slave to the lender. Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
8 Whoever sows injustice will reap calamity, and the rod of his fury will fail. Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
9 Whoever has a generous eye will be blessed, for he shares his bread with the poor. Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
10 Drive out the scoffer, and strife goes with him; quarreling and abuse will cease. Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
11 Whoever loves a pure heart and speaks graciously will have the king as his friend. Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
12 The eyes of our Father keep watch over knowledge, but he overturns the words of the traitor. Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
13 The lazy person says, "There is a lion outside! I will be killed in the streets!" Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
14 The mouth of forbidden women is a deep pit; whoever draws our Father's anger will fall into it. Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
15 Foolishness is bound up in the heart of a child, but the rod of discipline drives it far away. Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
16 Whoever oppresses the poor to enrich himself, or gives to the rich, will come only to poverty. Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
17 Listen carefully to the words of the wise, and apply your heart to my knowledge, Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
18 for it will be pleasant if you keep them within you, if all of them are ready on your lips. Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
19 So that your trust may be in our Father, I have made them known to you today, even to you. Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
20 Have I not written for you thirty sayings of counsel and knowledge, Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
21 to teach you what is right and true, so that you may give a true answer to those who sent you? Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
22 Do not rob the poor because he is poor, or crush the afflicted at the gate, Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
23 for our Father will plead their cause and will rob of life those who rob them. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
24 Do not befriend a man given to anger, and do not go with a hot-tempered man, Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
25 or you will learn his ways and entangle yourself in a snare. ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
26 Do not be one of those who give pledges, who put up security for debts. Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
27 If you have nothing to pay with, why should your bed be taken from under you? Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
28 Do not move the ancient boundary stone that your fathers set up. Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
29 Do you see a man skillful in his work? He will stand before kings; he will not stand before ordinary men. Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]