Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When you sit down to dine with a ruler, consider carefully what is before you, Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
2 and put a knife to your throat if you are a person ruled by appetite. tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3 Do not crave his delicacies, for they are deceptive food. Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4 Do not wear yourself out to get rich; have the wisdom to restrain yourself. Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5 The moment you look at wealth, it is gone, for it suddenly sprouts wings and flies off toward the heavens like an eagle. Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6 Do not eat the bread of a stingy man, and do not crave his delicacies, Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7 for he is the kind of man who keeps counting the cost. "Eat and drink!" he says to you, but his heart is not with you. Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
8 You will vomit up the little you have eaten and will have wasted your pleasant words. Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
9 Do not speak in the hearing of a fool, for he will despise the wisdom of your words. Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
10 Do not move an ancient boundary stone or encroach on the fields of the fatherless, Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
11 for their Redeemer is strong; our Father will take up their cause against you. nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
12 Apply your heart to instruction and your ears to words of knowledge. Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
13 Do not withhold discipline from a child; if you strike him with the rod, he will not die. Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14 Strike him with the rod, and you will deliver his soul from the grave. Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.
15 My son, if your heart is wise, my own heart will be glad as well. Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
16 My inmost being will rejoice when your lips speak what is right. Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
17 Do not let your heart envy sinners, but continue in the fear of our Father all day long. Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
18 Surely there is a future, and your hope will not be cut off. nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
19 Hear, my son, and be wise, and keep your heart on the right road. Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20 Do not be among those who get drunk on wine or those who gorge themselves on meat, Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21 for the drunkard and the glutton will come to poverty, and drowsiness will clothe them in rags. nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
22 Listen to your father, who gave you life, and do not despise your mother when she is old. Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
23 Buy truth and do not sell it; buy wisdom, instruction, and understanding. Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
24 The father of a righteous child will greatly rejoice; whoever fathers a wise son will delight in him. Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25 Let your father and mother be glad; let her who gave you birth rejoice. Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
26 My son, give me your heart, and let your eyes delight in my ways. Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27 For a prostitute is a deep pit, and an adulterous woman is a narrow well. Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28 She lies in wait like a robber and leads many men into faithlessness. Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
29 Who has misery? Who has sorrow? Who has strife? Who has complaints? Who has wounds for no reason? Who has bleary eyes? Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30 Those who linger long over wine, those who go to sample bowls of mixed wine. Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
31 Do not gaze at wine while it is red, while it sparkles in the cup and goes down smoothly. Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
32 In the end it bites like a serpent and stings like a viper. Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
33 Your eyes will see strange things, and your heart will utter twisted things. Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
34 You will be like one lying down in the heart of the sea, like one lying on the top of a ship's mast. Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
35 "They struck me, but I felt no pain; they beat me, but I did not know it. When will I wake up? I will look for another drink." Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]