Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Do not envy evil men, and do not desire to be with them, Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ.
2 for their hearts plot violence, and their lips speak of trouble. Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara.
3 By wisdom a house is built, and by understanding it is established; Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.
4 and by knowledge its rooms are filled with all precious and pleasant riches. Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa.
5 A wise man is full of strength, and a man of knowledge increases his power, Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
6 for by wise guidance you can wage your war, and victory comes through many counselors. Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
7 Wisdom is too high for a fool; at the gate, he has nothing to say. Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
8 Whoever plans to do evil will be called a schemer. Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
9 A fool's scheming is sin, and the scoffer is detestable to people. Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
10 If you falter in a time of trouble, your strength is small. Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
11 Rescue those being taken away to death, and hold back those stumbling toward the slaughter. Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.
12 If you say, "Look, we did not know this," does not he who weighs the heart perceive it? Does not he who watches over your soul know it? And will he not repay each person according to his deeds? Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
13 My son, eat honey, for it is good, and the honeycomb's drippings are sweet to your taste. Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
14 Know that wisdom is just like this to your soul; if you find it, there is a future, and your hope will not be cut off. Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
15 Do not lie in wait, you wicked man, against the home of the righteous; do not destroy his resting place, Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
16 for though the righteous falls seven times, he rises again, but the wicked stumble in disaster. Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
17 Do not rejoice when your enemy falls, and do not let your heart be glad when he stumbles, Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.
18 lest our Father see it and be displeased, and turn his anger away from him. Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.
19 Do not fret because of evildoers, and do not envy the wicked, Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
20 for the evil man has no future; the lamp of the wicked will be snuffed out. Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
21 My son, fear our Father and the king, and do not join with those who rebel against them, Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
22 for their disaster will rise suddenly, and who knows the ruin that both of them can bring? Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
23 These also are sayings of the wise: Showing partiality in judgment is not good. Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.
24 Whoever says to the guilty, "You are innocent," peoples will curse him and nations will denounce him, Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.
25 but it will go well for those who convict the guilty, and a rich blessing will come upon them. Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
26 An honest answer is like a kiss on the lips. Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
27 Prepare your work outside, get your fields ready, and after that build your house. Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
28 Do not be a witness against your neighbor without cause; would you deceive with your lips? Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
29 Do not say, "I will do to him as he did to me; I will pay the man back for what he has done." Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”
30 I passed by the field of a lazy man, by the vineyard of someone lacking sense, Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,
31 and there it was, all overgrown with thorns; the ground was covered with weeds, and its stone wall was broken down. hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.
32 Then I looked and took it to heart; I saw and received instruction. Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a:
33 A little sleep, a little slumber, a little folding of the hands to rest, Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike
34 and poverty will come upon you like a robber, and scarcity like an armed man. ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]