Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 These also are proverbs of Solomon, which the men of Hezekiah king of Judah copied out. Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
2 It is the glory of our Father to conceal a matter, but the glory of kings to search a matter out. Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
3 As the heavens are high and the earth is deep, so the heart of kings is unsearchable. Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
4 Take away the dross from the silver, and a vessel comes forth for the refiner. Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
5 Take away the wicked from before the king, and his throne will be established in righteousness. wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
6 Do not put yourself forward in the king's presence, and do not stand in the place of the great; Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
7 for it is better to be told, "Come up here," than to be put in a lower place in front of a noble you can see. ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
8 Do not rush into a quarrel, for what will you do in the end when your neighbor puts you to shame? e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
9 Argue your case with your neighbor himself, but do not disclose another's secret, Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
10 lest the one who hears it shame you, and your bad reputation never goes away. ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
11 A word spoken at the right moment is like apples of gold in settings of silver. Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
12 Like a ring of gold or an ornament of fine gold is wise correction to a listening ear. Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
13 Like the cold of snow in the time of harvest is a faithful messenger to those who send him; he refreshes the soul of his masters. Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
14 Like clouds and wind without rain is one who boasts of a gift never given. Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
15 By patience a ruler is persuaded, and a soft tongue breaks bone. Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
16 If you find honey, eat only enough, or you will have too much and vomit. Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
17 Don't visit your neighbor's house too often, or he will grow weary of you and hate you. Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
18 Like a club, a sword, and a sharp arrow is one who bears false witness against his neighbor. Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.
19 Like a bad tooth or a foot out of joint is trust in a faithless person in time of trouble. Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
20 Like one who takes off a garment on a cold day, like vinegar poured on baking soda, is the one who sings songs to a heavy heart. Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
21 If your enemy is hungry, give him bread to eat, and if he is thirsty, give him water to drink; Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.
22 for you will heap coals of fire on his head, and our Father will reward you. Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
23 The north wind brings forth rain, and a secretive tongue, angry looks. Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
24 It is better to live in a corner of the rooftop than in a shared house with a quarrelsome wife. Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
25 Like cold water to a weary soul is good news from a distant land. Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
26 Like a muddied spring or a polluted fountain is a righteous person who gives way before the wicked. Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
27 It is not good to eat too much honey, nor to seek your own glory. Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
28 Like a city broken into and left without walls is a person who has no control over his own spirit. Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]