Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 26 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Like snow in summer and like rain at harvest, honor is not fitting for a fool. Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
2 Like a fluttering sparrow or a darting swallow, an undeserved curse does not come to rest. Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
3 A whip for the horse, a bridle for the donkey, and a rod for the backs of fools. Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
4 Do not answer a fool according to his foolishness, or you yourself will be like him. A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
5 Answer a fool according to his foolishness, or he will be wise in his own eyes. Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
6 Whoever sends a message through a fool cuts off his own feet and drinks down violence. Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
7 Like the legs of a lame man hanging useless is a proverb in the mouth of fools. Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
8 Like binding a stone in a sling is giving honor to a fool. Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide. Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
9 Like a thornbush in the hand of a drunkard is a proverb in the mouth of fools. Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
10 Like an archer who wounds everyone is one who hires a fool or hires any passerby. Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.
11 As a dog returns to its vomit, so a fool repeats his foolishness. Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
12 Do you see someone wise in his own eyes? There is more hope for a fool than for him. Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
13 The lazy person says, "There is a lion in the road! A lion in the streets!" Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
14 As a door turns on its hinges, so the lazy person turns on his bed. Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
15 The lazy person buries his hand in the dish; it wearies him to bring it back to his mouth. Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
16 The lazy person is wiser in his own eyes than seven who answer wisely. Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihe karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
17 Like grabbing a dog by the ears is a passerby who meddles in a quarrel not his own. Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
18 Like a madman shooting firebrands, arrows, and death, Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,
19 so is the one who deceives his neighbor and says, "I was only joking!" ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
20 Without wood a fire goes out, and without a gossip a quarrel dies down. Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
21 As charcoal to embers and wood to fire, so a quarrelsome person kindles strife. Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
22 The words of a gossip are like choice morsels; they sink down into the inmost parts. Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
23 Like a glaze covering an earthen pot are smooth lips with an evil heart. Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
24 An enemy disguises himself with his lips, but in his heart he harbors deceit. Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
25 When he speaks graciously, do not believe him, for seven abominations fill his heart. Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
26 Though his hatred is hidden by deceit, his wickedness will be exposed in the assembly. Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
27 Whoever digs a pit will fall into it, and a stone rolls back on the one who rolls it. Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
28 A lying tongue hates those it crushes, and a flattering mouth works ruin. Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]