Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 27 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Do not boast about tomorrow, for you do not know what a day may bring. Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
2 Let someone else praise you, and not your own mouth; a stranger, and not your own lips. Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
3 A stone is heavy and the sand a burden, but a fool's provocation is heavier than both. Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
4 Wrath is cruel and anger is overwhelming, but who can stand before jealousy? Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
5 Open rebuke is better than love that stays hidden. Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
6 A friend's wounds are faithful, but an enemy's kisses are deceitful. Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
7 A well-fed person tramples honeycomb, but to the hungry even what is bitter tastes sweet. Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
8 A man who strays from his home is like a bird that strays from its nest. Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
9 Oil and incense gladden the heart, and the sweetness of a friend comes from heartfelt counsel. Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
10 Do not forsake your friend or your father's friend, and do not go to your brother's house when disaster strikes; better a neighbor nearby than a brother far off. Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
11 Be wise, my son, and make my heart glad, so that I can answer anyone who taunts me. Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
12 The prudent sees danger and takes cover, but the simple keep going and pay the price. Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
13 Take the garment of one who puts up security for a stranger; hold it as collateral when he does so for a foreign woman. Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
14 Whoever blesses his neighbor with a loud voice early in the morning, it will be taken as a curse. Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
15 A quarrelsome wife is like a constant dripping on a rainy day. Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
16 Restraining her is like restraining the wind, or grasping oil with the right hand. Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
17 Iron sharpens iron, and one person sharpens another. Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
18 Whoever tends a fig tree will eat its fruit, and whoever guards his master will be honored. Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
19 As water reflects the face, so the heart reflects the person. Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
20 The grave and Destruction are never satisfied, and a person's eyes are never satisfied. Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
21 The crucible is for silver and the furnace for gold, and a person is tested by the praise he receives. Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
22 Though you grind a fool in a mortar with a pestle, along with the grain, his foolishness will not leave him. Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
23 Know well the condition of your flocks, and give careful attention to your herds. Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
24 For riches do not last forever, nor does a crown endure to every generation. nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
25 When the grass is gone and the new growth appears and the mountain herbs are gathered, Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
26 the lambs will provide your clothing, and the goats will provide the price of a field; Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
27 and there will be enough goats' milk for your food, for the food of your household and to sustain your servant girls. Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]