Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 28 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The wicked flee when no one pursues, but the righteous are as bold as a lion. Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
2 When a land rebels, it has many rulers, but with a man of understanding and knowledge, it stays stable. Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
3 A poor man who oppresses the helpless is like a driving rain that leaves no food. Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
4 Those who forsake the law praise the wicked, but those who keep the law strive against them. Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
5 Evil people do not understand justice, but those who seek our Father understand it fully. Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
6 Better is a poor man who walks with integrity than a rich man crooked in his ways. Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
7 Whoever keeps the law is a son with understanding, but a companion of gluttons shames his father. Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
8 Whoever multiplies his wealth by interest and unjust gain gathers it for one who is generous to the poor. Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
9 If anyone refuses to listen to the law, even his prayer is detestable. Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
10 Whoever leads the upright astray down an evil path will fall into his own pit, but the blameless will inherit good things. Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
11 A rich man is wise in his own eyes, but a poor man with understanding sees right through him. Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
12 When the righteous triumph, there is great glory, but when the wicked rise, people go into hiding. Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
13 Whoever conceals his sins will not prosper, but whoever confesses and turns from them will find mercy. Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
14 Blessed is the one who always remains reverent, but whoever hardens his heart will fall into calamity. Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
15 Like a roaring lion or a charging bear is a wicked ruler over a helpless people. Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
16 A ruler who lacks understanding is a cruel oppressor, but whoever hates unjust gain will prolong his days. Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
17 A man weighed down by the guilt of bloodshed will be a fugitive until death; let no one support him. Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
18 Whoever walks in integrity will be kept safe, but whoever is crooked in his ways will suddenly fall. Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
19 Whoever works his land will have plenty of bread, but whoever chases empty pursuits will have plenty of poverty. Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
20 A faithful man will abound with blessings, but whoever rushes to get rich will not go unpunished. Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
21 Showing partiality is not good, yet for a piece of bread a man will do wrong. Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
22 A stingy man rushes after wealth and does not know that poverty will overtake him. Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
23 Whoever rebukes a man will in the end find more favor than one who flatters with his tongue. Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
24 Whoever robs his father or mother and says, "It is no sin," is a companion to one who destroys. Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
25 A greedy man stirs up strife, but whoever trusts in our Father will be enriched. Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
26 Whoever trusts in his own heart is a fool, but whoever walks in wisdom will be kept safe. Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
27 Whoever gives to the poor will lack nothing, but whoever closes his eyes to them will receive many curses. Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.
28 When the wicked rise, people go into hiding, but when they perish, the righteous flourish. Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]