Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 29 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Whoever is often corrected yet refuses to listen will suddenly be broken beyond healing. Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
2 When the righteous flourish, the people rejoice, but when the wicked rule, the people groan. Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
3 A man who loves wisdom brings joy to his father, but a companion of prostitutes squanders his wealth. Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
4 By justice a king gives a land stability, but one who is greedy for bribes tears it down. Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5 A man who flatters his neighbor spreads a net for his feet. Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
6 An evil man is snared by his own sin, but the righteous sing and rejoice. Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
7 The righteous care about justice for the poor, but the wicked have no such understanding. Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
8 Mockers set a city ablaze, but the wise calm the anger. Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
9 When a wise man goes to court with a fool, the fool rages and scoffs, and there is no peace. Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
10 The bloodthirsty hate the blameless and seek to kill the upright. Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
11 A fool vents all his anger, but a wise man holds it back and keeps himself calm. Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12 If a ruler listens to lies, all his officials become wicked. Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13 The poor man and the oppressor have this in common: our Father gives sight to the eyes of both. Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
14 If a king judges the poor with fairness, his throne will be established forever. Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
15 The rod and a word of correction give wisdom, but a child left to himself brings shame to his mother. Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
16 When the wicked flourish, wrongdoing flourishes, but the righteous will see the wicked's downfall. Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
17 Discipline your son, and he will give you peace; he will bring delight to your heart. Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
18 Where there is no revelation, the people run wild, but blessed is the one who keeps the law. Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
19 A servant cannot be corrected by words alone; though he understands, he will not obey. Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
20 Do you see a man who is hasty with his words? There is more hope for a fool than for him. Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
21 Pamper a servant from childhood, and in the end he will become like an heir. Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi, ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
22 An angry man stirs up strife, and a hot-tempered man commits many sins. Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ, onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
23 A man's pride brings him low, but a humble spirit gains honor. Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa, ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
24 An accomplice of a thief is his own enemy; he hears the curse but says nothing. Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
25 Fear of man lays a snare, but whoever trusts in our Father is kept safe. Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
26 Many seek a ruler's favor, but justice for a person comes from our Father. Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
27 An unjust man is detestable to the righteous, and an upright person is detestable to the wicked. Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]