Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 17 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Better a dry crust eaten in peace than a house full of feasting with strife. Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
2 A prudent servant will rule over a disgraceful son and will share the inheritance among the brothers. Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
3 The crucible is for silver and the furnace for gold, but our Father tests hearts. Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
4 An evildoer listens to wicked lips; a liar listens to a destructive tongue. Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
5 Whoever mocks the poor insults his Maker; whoever gloats over disaster will not go unpunished. Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
6 Grandchildren are the crown of the aged, and the glory of children is their parents. Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
7 Fine speech is not fitting for a fool—still less are lying lips for a noble. Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
8 A bribe seems like a magic charm to the one who gives it; wherever he turns, he thinks he will succeed. Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
9 Whoever covers an offense seeks love, but whoever keeps bringing it up separates close friends. Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
10 A rebuke goes deeper into a person of understanding than one hundred blows into a fool. Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
11 A rebellious man seeks only evil, and a cruel messenger will be sent against him. Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.
12 Better to meet a bear robbed of her cubs than a fool in his foolishness. Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
13 If anyone returns evil for good, evil will never leave his house. Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
14 Starting a quarrel is like breaching a dam, so drop the dispute before it bursts out. Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
15 Whoever justifies the wicked and whoever condemns the righteous—both alike are detestable to our Father. Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
16 Why should a fool have money in hand to buy wisdom, when he has no heart to learn? Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
17 A friend loves at all times, and a brother is born for a time of trouble. Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
18 One who lacks sense shakes hands on a pledge and puts up security for his neighbor. Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
19 Whoever loves wrongdoing loves strife; whoever builds his gate high invites destruction. Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
20 A crooked heart finds no good, and a twisted tongue falls into trouble. Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
21 Whoever fathers a fool brings grief on himself; the father of a godless fool has no joy. Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
22 A joyful heart is good medicine, but a crushed spirit dries up the bones. Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
23 A wicked man takes a bribe in secret to pervert the ways of justice. Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
24 A discerning person keeps wisdom in view, but the eyes of a fool wander to the ends of the earth. Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
25 A foolish son is a grief to his father and bitterness to the mother who bore him. Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
26 To punish the righteous is not good, nor to flog the noble for their integrity. Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
27 Whoever holds back his words has knowledge, and one with a calm spirit is a person of understanding. Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
28 Even a fool who keeps silent is thought wise; when he closes his lips, he seems discerning. A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]