Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 16 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The plans of the heart belong to man, but the answer of the tongue comes from our Father. Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
2 All a man's ways are pure in his own eyes, but our Father weighs the motives. Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
3 Commit your works to our Father, and your plans will be established. Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
4 Our Father has made everything for its purpose, even the wicked for the day of trouble. Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
5 Everyone proud of heart is detestable to our Father; be assured, he will not go unpunished. Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
6 Loving devotion and faithfulness atone for sin, and the fear of our Father turns a person away from evil. Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
7 When a man's ways please our Father, our Father makes even the man's enemies live at peace with him. Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
8 Better a little with righteousness than great income with injustice. Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.
9 The heart of man plans his way, but our Father establishes his steps. Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
10 A divine verdict is on the lips of a king; his mouth does not betray justice. Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.
11 Honest scales and balances belong to our Father; every weight and measure is his work. Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.
12 It is detestable for kings to do wickedness, for a throne is established through righteousness. Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.
13 Righteous lips are the delight of kings, and they love the one who speaks what is right. Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu, ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.
14 A king's wrath is a messenger of death, but a wise man will appease it. Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ. Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.
15 In the light of a king's face is life, and his favor is like a cloud bringing the spring rain. Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
16 How much better to get wisdom than gold! Getting understanding is worth more than silver. Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
17 The highway of the upright turns away from evil; whoever guards his way protects his life. Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
18 Pride goes before destruction, and a haughty spirit before a fall. Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
19 Better to be lowly in spirit among the poor than to share the plunder with the proud. Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
20 Whoever heeds the word will find good, and blessed is the one who trusts in our Father. Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
21 The wise of heart is called discerning, and pleasant speech increases persuasiveness. A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.
22 Understanding is a fountain of life to the one who has it, but fools are corrected by their own foolishness. Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.
23 The heart of the wise makes his speech wise and adds persuasiveness to his lips. Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
24 Pleasant words are a honeycomb, sweet to the soul and healing to the bones. Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
25 There is a way that seems right to a man, but its end is the way of death. Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
26 A worker's appetite works for him; his hunger drives him on. Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
27 A worthless man digs up evil, and on his lips is a scorching fire. Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
28 A perverse man spreads strife, and a gossip separates close friends. Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
29 A violent man entices his neighbor and leads him down a harmful path. Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.
30 Whoever winks his eyes plots perversity; whoever purses his lips is bent on evil. Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
31 Gray hair is a crown of glory; it is gained in the way of righteousness. Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
32 Better a patient person than a mighty one, and one who rules his spirit than one who takes a city. Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
33 The lot is cast into the lap, but its every decision is from our Father. A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]