Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 15 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A gentle answer turns away wrath, but a harsh word stirs up anger. Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
2 The tongue of the wise commends knowledge, but the mouths of fools pour out foolishness. Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.
3 The eyes of our Father are in every place, keeping watch on the evil and the good. Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.
4 A gentle tongue is a tree of life, but a corrupt tongue crushes the spirit. Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
5 A fool despises his father's instruction, but whoever heeds correction is prudent. Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
6 In the house of the righteous there is much treasure, but the income of the wicked brings trouble. Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.
7 The lips of the wise spread knowledge, but not so the hearts of fools. Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
8 The sacrifice of the wicked is detestable to our Father, but the prayer of the upright is his delight. Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.
9 The way of the wicked is detestable to our Father, but he loves the one who pursues righteousness. Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.
10 There is severe discipline for the one who leaves the path, and whoever hates correction will die. Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.
11 The grave and Destruction lie open before our Father; how much more the hearts of all people! Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?
12 A scoffer does not love to be corrected; he will not go to the wise. Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.
13 A glad heart makes a cheerful face, but a sorrowful heart crushes the spirit. Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.
14 A discerning heart seeks knowledge, but the mouths of fools feed on foolishness. Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.
15 All the days of the afflicted are hard, but a cheerful heart has a continual feast. Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.
16 Better a little with the fear of our Father than great treasure and trouble with it. Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
17 Better a meal of vegetables where there is love than a fattened ox with hatred. Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
18 A hot-tempered man stirs up strife, but one who is slow to anger calms a quarrel. Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.
19 The way of the lazy is like a hedge of thorns, but the path of the upright is a level highway. Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
20 A wise son makes a glad father, but a foolish man despises his mother. Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
21 Foolishness is joy to one who lacks sense, but a person of understanding walks a straight path. Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya, ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.
22 Plans fail without counsel, but with many advisers they succeed. Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala, ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.
23 A person finds joy in giving an apt reply, and how good is a word at the right time! Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
24 The path of life leads upward for the prudent, turning him away from the grave below. Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.
25 Our Father tears down the house of the proud, but he protects the widow's boundary. Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako, ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.
26 The thoughts of the wicked are detestable to our Father, but gracious words are pure. Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.
27 Whoever is greedy for unjust gain brings trouble on his own household, but the one who hates bribes will live. Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
28 The heart of the righteous weighs how to answer, but the mouth of the wicked pours out evil. Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.
29 Our Father is far from the wicked, but he hears the prayer of the righteous. Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.
30 The light of the eyes brings joy to the heart, and good news refreshes the bones. Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ. Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.
31 The ear that listens to life-giving correction will dwell among the wise. Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ.
32 Whoever ignores instruction despises himself, but whoever listens to correction gains understanding. Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.
33 The fear of our Father is the instruction of wisdom, and humility comes before honor. Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]