Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The wisest of women builds her house, but foolishness tears hers down with her own hands. Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.
2 Whoever walks in uprightness fears our Father, but one whose ways are crooked despises him. Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.
3 A fool's mouth is a rod for his own pride, but the lips of the wise protect them. Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.
4 Where there are no oxen, the manger stays clean, but an abundant harvest comes through the strength of an ox. Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.
5 A faithful witness does not lie, but a false witness breathes out lies. Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.
6 The scoffer seeks wisdom and finds none, but knowledge comes easily to the discerning. Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.
7 Stay away from a fool, for you will find no knowledge on his lips. Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.
8 The wisdom of the prudent is to discern their way, but the foolishness of fools is deceit. Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.
9 Fools mock the guilt offering, but among the upright there is favor. Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.
10 The heart knows its own bitterness, and no stranger shares in its joy. Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.
11 The house of the wicked will be destroyed, but the tent of the upright will flourish. A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.
12 There is a way that seems right to a person, but its end is the way of death. Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
13 Even in laughter the heart may ache, and the end of joy may be grief. Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
14 The backslider in heart will be filled with the fruit of his ways, and a good person with the fruit of his. Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.
15 The simple believe anything, but the prudent give thought to their steps. Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.
16 The wise fear and turn away from evil, but a fool is reckless and overconfident. Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
17 A quick-tempered person acts foolishly, and one who plots evil schemes is hated. Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.
18 The simple inherit foolishness, but the prudent are crowned with knowledge. Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.
19 The evil bow down before the good, and the wicked at the gates of the righteous. Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.
20 The poor are shunned even by their neighbors, but the rich have many friends. Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.
21 Whoever despises his neighbor sins, but blessed is the one who is kind to the poor. Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.
22 Do not those who plot evil go astray? But covenant love and faithfulness belong to those who plan good. Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
23 In all hard work there is profit, but mere talk leads only to poverty. Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.
24 The crown of the wise is their wealth, but the foolishness of fools yields only foolishness. Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.
25 A truthful witness saves lives, but one who breathes out lies is treacherous. Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.
26 In the fear of our Father is strong confidence, and his children will have a refuge. Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.
27 The fear of our Father is a fountain of life, turning a person away from the snares of death. Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
28 A large population is a king's glory, but without people a prince is ruined. Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.
29 Whoever is slow to anger has great understanding, but a hot temper exalts foolishness. Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
30 A tranquil heart gives life to the body, but envy rots the bones. Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure.
31 Whoever oppresses the poor reproaches our Father, their Maker, but whoever is kind to the needy honors him. Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.
32 The wicked are brought down by their own evil, but the righteous find refuge even in death. Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.
33 Wisdom rests in the heart of the discerning, but even among fools it makes itself known. Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.
34 Righteousness exalts a nation, but sin is a disgrace to any people. Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.
35 A king's favor rests on a wise servant, but his wrath falls on one who acts shamefully. Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]