Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 A wise son heeds his father's instruction, but a scoffer does not listen to rebuke. Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
2 From the fruit of his mouth a person enjoys good things, but the appetite of the treacherous is for violence. Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
3 Whoever guards his mouth protects his life, but one who opens his lips wide comes to ruin. Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
4 The lazy person craves and gets nothing, but the appetite of the diligent is richly satisfied. Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
5 The righteous hates falsehood, but the wicked brings shame and disgrace. Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
6 Righteousness guards the one whose way is blameless, but wickedness overthrows the sinner. Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
7 One person pretends to be rich, yet has nothing; another pretends to be poor, yet has great wealth. Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
8 A person's wealth may ransom his life, but the poor hears no threat. Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.
9 The light of the righteous shines joyfully, but the lamp of the wicked will be snuffed out. Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
10 Arrogance breeds nothing but strife, but wisdom is with those who seek advice. Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
11 Wealth gained by fraud dwindles away, but whoever gathers little by little makes it grow. Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
12 Hope deferred makes the heart sick, but desire fulfilled is a tree of life. Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
13 Whoever despises the word brings ruin on himself, but the one who reveres the commandment will be rewarded. Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
14 The teaching of the wise is a fountain of life, turning a person away from the snares of death. Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
15 Good sense wins favor, but the way of the treacherous is their undoing. Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
16 Every prudent person acts with knowledge, but a fool flaunts his foolishness. Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
17 A wicked messenger falls into trouble, but a faithful envoy brings healing. Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.
18 Poverty and shame come to whoever ignores discipline, but the one who heeds correction is honored. Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.
19 A desire fulfilled is sweet to the soul, but turning away from evil is detestable to fools. Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.
20 Whoever walks with the wise grows wise, but the companion of fools suffers harm. Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.
21 Disaster pursues sinners, but good rewards the righteous. Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.
22 A good person leaves an inheritance to his grandchildren, but the sinner's wealth is stored up for the righteous. Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.
23 The unplowed field of the poor could yield abundant food, but it is swept away for lack of justice. Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.
24 Whoever withholds the rod hates his son, but the one who loves him is diligent to discipline him. Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
25 The righteous eats to his heart's content, but the belly of the wicked goes hungry. Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]