Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Whoever loves discipline loves knowledge, but whoever hates correction is senseless. Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.
2 A good man obtains favor from our Father, but he condemns the man who schemes evil. Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.
3 No one is established by wickedness, but the root of the righteous will never be moved. Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
4 A wife of noble character is her husband's crown, but one who brings shame is like decay in his bones. Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
5 The plans of the righteous are just, but the advice of the wicked is deceitful. Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
6 The words of the wicked lie in wait for blood, but the speech of the upright rescues the innocent. Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
7 The wicked are overthrown and are no more, but the house of the righteous will stand. Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
8 A person is praised according to their good sense, but one with a warped mind is despised. Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.
9 Better to be lowly and have a servant than to pretend to greatness and go hungry. Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
10 The righteous care for the needs of their animals, but even the mercy of the wicked is cruel. Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
11 Whoever works their land will have plenty of food, but whoever chases worthless pursuits lacks sense. Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
12 The wicked crave the plunder of evil men, but the root of the righteous yields fruit. Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
13 An evil man is trapped by his sinful talk, but the righteous escapes from trouble. A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
14 From the fruit of their words a person is filled with good things, and the work of their hands comes back to reward them. Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
15 The way of a fool seems right in his own eyes, but the wise listen to advice. Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
16 A fool shows his anger at once, but the prudent overlook an insult. Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
17 Whoever speaks the truth gives honest testimony, but a false witness tells lies. Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
18 Reckless words pierce like a sword, but the tongue of the wise brings healing. Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
19 Truthful lips endure forever, but a lying tongue lasts only a moment. Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
20 Deceit fills the hearts of those who plot evil, but joy belongs to those who promote peace. Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
21 No harm overtakes the righteous, but the wicked are full of trouble. Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
22 Lying lips are detestable to our Father, but those who act faithfully are his delight. Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
23 The prudent keep their knowledge to themselves, but the heart of fools blurts out foolishness. Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
24 Diligent hands will rule, but laziness ends in forced labor. Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
25 Anxiety weighs down the heart, but a kind word cheers it up. Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
26 The righteous guide their neighbor, but the way of the wicked leads them astray. Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
27 The lazy do not roast their game, but the diligent prize their possessions. Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
28 In the path of righteousness there is life, and along that way there is no death. Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]