Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Dishonest scales are an abomination to our Father, but accurate weights are his delight. Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
2 When pride comes, then comes disgrace, but wisdom comes with the humble. Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
3 The integrity of the upright guides them, but the crookedness of the treacherous destroys them. Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
4 Wealth does not profit in the day of wrath, but righteousness delivers from death. Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
5 The righteousness of the blameless makes their way straight, but the wicked falls by his own wickedness. Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
6 The righteousness of the upright delivers them, but the treacherous are trapped by their own craving. Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
7 When a wicked person dies, his hope perishes, and his confidence in his own strength comes to nothing. Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
8 The righteous is delivered from trouble, and the wicked comes into it in his place. Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
9 With his mouth the godless destroys his neighbor, but through knowledge the righteous are delivered. Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
10 When things go well for the righteous, the city rejoices, and when the wicked perish, there are shouts of joy. Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
11 By the blessing of the upright a city is exalted, but by the mouth of the wicked it is torn down. A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
12 Whoever despises his neighbor lacks sense, but a person of understanding stays silent. Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
13 A gossip goes about revealing secrets, but someone with a trustworthy spirit can keep a secret. Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
14 Where there is no guidance, a people falls, but in an abundance of counselors there is safety. Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
15 Whoever puts up security for a stranger will surely suffer for it, but whoever hates shaking hands on a pledge is secure. Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
16 A gracious woman attains honor, and ruthless men attain riches. Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
17 A kind person benefits himself, but a cruel person brings trouble on himself. Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
18 The wicked earns deceptive wages, but whoever sows righteousness earns a true reward. Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
19 Whoever is steadfast in righteousness finds life, but whoever pursues evil runs to his own death. Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
20 Those of crooked heart are an abomination to our Father, but those whose ways are blameless are his delight. Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
21 You can be sure the evil person will not go unpunished, but the children of the righteous will go free. Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
22 Like a gold ring in a pig's snout is a beautiful woman who shows no discretion. Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
23 The desire of the righteous ends only in good, but the hope of the wicked ends in wrath. Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
24 One person gives freely, yet grows all the richer; another withholds what is right, only to end up in need. Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
25 A generous soul will be enriched, and whoever refreshes others will himself be refreshed. E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
26 The people curse whoever holds back grain, but the one who sells it is blessed. Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
27 Whoever diligently seeks good seeks favor, but whoever searches for evil, evil will come to him. Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
28 Whoever trusts in his riches will fall, but the righteous will flourish like green leaves. Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
29 Whoever brings trouble on his own household will inherit the wind, and the fool will be servant to the wise of heart. Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
30 The fruit of the righteous is a tree of life, and whoever wins souls is wise. Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
31 If the righteous is repaid on earth, how much more the wicked and the sinner! Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]