Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 11 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyịma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.

2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.

3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.

4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.

5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.

6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.

7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.

8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.

9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.

10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.

11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.

12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.

13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.

14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.

15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.

16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.

17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.

18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.

19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.

20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asịma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.

21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.

22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.

23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.

24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.

25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.

26Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.

27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.

28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.

29Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.

30Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.

31Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]