Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The proverbs of Solomon: A wise son brings joy to his father, but a foolish son brings grief to his mother. Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
2 Treasures gained by wickedness do not profit, but righteousness rescues from death. Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
3 Our Father will not let the righteous go hungry, but he thwarts the craving of the wicked. Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
4 Lazy hands make you poor, but diligent hands bring wealth. Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
5 He who gathers in summer is a prudent son, but he who sleeps during harvest is a son who brings shame. Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
6 Blessings rest on the head of the righteous, but the mouth of the wicked conceals violence. Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
7 The memory of the righteous is a blessing, but the name of the wicked will rot. Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
8 A wise heart accepts commands, but a babbling fool comes to ruin. Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
9 Whoever walks in integrity walks securely, but he who makes his ways crooked will be found out. Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
10 Whoever winks causes trouble, and a babbling fool comes to ruin. Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
11 The mouth of the righteous is a fountain of life, but the mouth of the wicked conceals violence. Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
12 Hatred stirs up conflict, but love covers all offenses. Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
13 On the lips of the discerning, wisdom is found, but a rod is for the back of one who lacks sense. Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
14 The wise store up knowledge, but the mouth of a fool invites ruin. Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
15 The wealth of the rich is their fortified city; the ruin of the poor is their poverty. Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
16 The wage of the righteous leads to life; the gain of the wicked leads to sin. Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
17 Whoever accepts discipline is on the path to life, but he who ignores correction leads others astray. Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
18 Whoever conceals hatred is a liar, and whoever spreads slander is a fool. Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
19 Where words are many, sin is never absent; but whoever holds his tongue is wise. Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
20 The tongue of the righteous is choice silver; the heart of the wicked is worth little. Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
21 The lips of the righteous nourish many, but fools die for lack of sense. Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
22 The blessing of our Father brings wealth, and he adds no sorrow with it. Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
23 Doing wickedness is a game to a fool, but wisdom is the delight of a person of understanding. Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
24 What the wicked dreads will come upon him, but the desire of the righteous will be granted. Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
25 When the storm has passed, the wicked are gone, but the righteous are established forever. Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
26 Like vinegar to the teeth and smoke to the eyes, so is the sluggard to those who send him. Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
27 The fear of our Father lengthens life, but the years of the wicked will be cut short. Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
28 The hope of the righteous brings joy, but the expectation of the wicked will perish. Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
29 The way of our Father is a refuge for the blameless, but ruin for those who do evil. Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
30 The righteous will never be shaken, but the wicked will not remain in the land. A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
31 The mouth of the righteous yields wisdom, but the perverse tongue will be cut off. Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
32 The lips of the righteous know what is acceptable, but the mouth of the wicked, only what is perverse. Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]