Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Wisdom has built her house; she has hewn out her seven pillars. Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa.
2 She has slaughtered her animals; she has mixed her wine; she has also set her table. O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.
3 She has sent out her young women to call from the highest places of the town: O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
4 "Whoever is simple, let him come in here!" To the one who lacks sense she says, “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
5 "Come, eat my bread and drink the wine I have mixed. “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
6 Leave your simple ways, and live; walk in the way of insight." Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
7 Whoever corrects a mocker brings abuse on himself, and whoever rebukes a wicked man gets hurt. Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
8 Do not rebuke a mocker, or he will hate you; rebuke a wise man, and he will love you. Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
9 Instruct a wise man and he will grow wiser; teach a righteous man and he will learn even more. Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
10 The fear of our Father is the beginning of wisdom, and the knowledge of the Holy One is insight. Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
11 For by me your days will be multiplied, and years will be added to your life. Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
12 If you are wise, you are wise for yourself; if you scoff, you alone will bear it. Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
13 The woman Folly is loud; she is naive and knows nothing. Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
14 She sits at the door of her house, on a seat at the highest places of the town, Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
15 calling to those who pass by, who are going straight on their way: na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha,
16 "Whoever is simple, let him come in here!" And to the one who lacks sense she says, “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
17 "Stolen water is sweet, and bread eaten in secret is pleasant." “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
18 But he does not know that the dead are there, that her guests are in the depths of the grave. Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]