Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Does not Wisdom call out, and understanding raise her voice? Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
2 Atop the heights along the way, where the paths meet, she takes her stand. Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
3 Beside the gates, at the entrance to the city, at the doorways she cries aloud: Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
4 "To you, all people, I call out; my voice reaches all humanity. ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
5 You who are simple, learn prudence; you who are foolish, gain an understanding heart. Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
6 Listen, for I speak of noble things, and everything I say is right. Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
7 My mouth utters truth, for my lips detest wickedness. Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
8 All the words of my mouth are righteous; none of them is twisted or crooked. Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
9 To the one who understands they are all clear, and right to those who find knowledge. Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
10 Take my instruction instead of silver, and knowledge rather than choice gold, Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
11 for wisdom is better than jewels, and nothing you desire can compare with her. Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
12 I, Wisdom, dwell with prudence, and I find knowledge and discretion. “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
13 The fear of our Father is to hate evil. Pride and arrogance, the evil way, and perverse speech I hate. Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
14 Counsel is mine, and sound wisdom; I am understanding; strength is mine. Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.
15 By me kings reign, and rulers decree what is just; Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
16 by me princes govern, and nobles—all who rule with justice. Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
17 I love those who love me, and those who search for me find me. Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
18 With me are riches and honor, enduring wealth and righteousness. Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume.
19 My fruit is better than gold, than the finest gold, and what I yield surpasses choice silver. Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo.
20 I walk in the way of righteousness, along the paths of justice, Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
21 giving wealth as an inheritance to those who love me, and filling their treasuries. Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
22 Our Father brought me forth at the beginning of his way, before his works of old. “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
23 From ages past I was established, from the beginning, before the earth began. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
24 When there were no deep waters I was brought forth, when there were no springs overflowing with water. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
25 Before the mountains were settled, before the hills, I was brought forth, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
26 while he had not yet made the earth and its fields, or the first dust of the world. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
27 When he set the heavens in place, I was there; when he drew a circle over the face of the deep, Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
28 when he set the skies in place above, when he established the springs of the deep, mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
29 when he set for the sea its boundary so the waters would not cross their limits, when he marked out the foundations of the earth, mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
30 then I was beside him as a master craftsman, and I was his daily delight, rejoicing before him always, Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
31 rejoicing in his whole world, and delighting in the human family. Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
32 And now, my children, listen to me: blessed are those who keep my ways. “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
33 Listen to instruction and be wise; do not ignore it. Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
34 Blessed is the one who listens to me, watching daily at my gates, waiting beside my doorway. Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
35 For whoever finds me finds life and receives favor from our Father. nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
36 But whoever misses me harms his own soul; all who hate me love death." Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]