Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 18 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.

2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.

3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.

4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.

5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.

6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.

7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.

8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

9Onye dị umengwụ nʼọrụ yabụ nwanne nke onye mbibi.

10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.

13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntịbụ enweghị uche na ihe ihere.

14Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?

15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.

16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.

17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.

18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọdị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.

19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.

20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.

21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.

22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.

24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]