Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosea 6 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Nnọgide na nnupu isi Izrel

1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.Ya onwe ya adọkaala anyị,ọ ga-agwọkwa anyị;o tipụla anyị ọnya,ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.

2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.

3Ka anyị mara Onyenwe anyị;ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”

4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.

5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.

6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.

7Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

8Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.

9Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,otu a ka ndị nchụajasi egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.

10Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,emerụọkwala Izrel.

11“Ma nye gị onwe gị, Juda,owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.“Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]