Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosea 5 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ikpe ọmụma megide Izrel

1“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja!Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel!Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze.Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara.Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa,na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.

2Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ,aga m ata ha niile ahụhụ.

3Amaara m ihe niile gbasara Ifrem,ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ.Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna;gị Izrel, emerụọkwala gị.

4“Omume ha agaghị ekweka ha laghachikwute Chineke ha,nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha,ha amaghịkwa Onyenwe anyị.

5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha,Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha,Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.

6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha,gaa ịchọ Onyenwe anyị,ha agaghị achọta ya.Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko.Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ haga-eripịa ha na ala ubi ha.

8“Fụọ opi ike na Gibea,fụkwaa mpi anụ na Rema.Tie mkpu agha na Bet-Aven.Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.

9A ga-ebibi Ifrem kpamkpamnʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.Nʼetiti ebo nke Izrel niile,ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.

10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụna-ewezuga oke ala,aga m awụkwasị ha iwe mdịka uju mmiri ozuzo.

11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu,onye e ji ike na-azọpịa,nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.

12Adị m ka nla nye Ifrem,dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa,Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ,mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa,ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi.Ma ọ pụghị ịgwọ gị,maọbụ gwọọ ọnya gị niile.

14Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifremdịkwa ka nwa ọdụm nye Juda.Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ.Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.

15Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m,ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha,ma chọọ ihu m;nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha,ha ga-achọsi m ike.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]