Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hosea 4 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Okwu Onyenwe anyị megide Izrel

1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubomegide unu ndị bi nʼala a.“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.

2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ,izu ohi na ịkwa iko.Ọgbaaghara dị nʼebe niile,ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.Nʼihi na ndị gị dịkandị na-eseso onye nchụaja okwu.

5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi

6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụmụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

7Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ,otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.

8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.

9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.

10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha.Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba,nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị,were onwe ha nyefee

11nʼaka ịgba akwụna,na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,nke na-ewepụ mmụọ nghọta.

12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.

13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,ebe ndo ya dị ezi mma.Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.

14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,mgbe ha na-agba akwụna,maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụmgbe ha na-akwa iko,nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.“Unu agakwala Gilgal,unu agakwala ruo Bet-Aven,unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’

16Ndị Izrel dị isiikedịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ hadịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?

17Ifrem na arụsị agbaala ndụhapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.

18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.

19Ifufe ga-ebupụ ha,aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]