Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 11 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ịgbasapụ aka

1Gbasapụ aka gị nʼinye onyinyenʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.

2Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọnʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.

3Mgbe eluigwe rujiri,mmiri ga-ezo;mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.

4Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.

5Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si agamaọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,onye mere ihe niile.

6Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,esepụkwala aka nʼanyasị,nʼihi na ị maghị nke ga-eto,maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,ha niile nwere ike too nke ọma.

Cheta Chineke nʼokorobịa gị

7Ìhè dị ụtọ,ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.

8Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,ya ṅụrịa nʼime ihe niile,ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrịga-adị ọtụtụ.Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

9Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.Mee ihe niile ị chọrọ ime;gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.Kama, ghọtakwa nke a,na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.

10Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]