Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Psalms 9 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid.

Ekele nʼihi nnapụta Chineke

1O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.

2Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.

3Ndị iro m na-alaghachi azụ,ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.

4I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.

5I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.

6Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,I hopukwala obodo ha niile.Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.

7Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.

8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.

9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

10Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.

11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.

12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.

13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,

14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gịnʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn,nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.

15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.

16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela

17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.

18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.

19O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.

20O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. Sela

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]