Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isaiah 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The word that Isaiah son of Amoz saw concerning Judah and Jerusalem. Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
2 In the last days the mountain of our Father's house will be firmly established as the highest of the mountains, raised above the hills, and all the nations will stream to it. Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3 Many peoples will come and say, "Come, let us go up to the mountain of God, to his house, so he can teach us his ways and we can walk in his paths." For instruction will go out from Zion, and the word of our Father from Jerusalem. Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
4 He will judge between the nations and settle disputes for many peoples. They will beat their swords into plowshares and their spears into pruning hooks; nation will not lift up sword against nation, nor will they train for war anymore. Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5 House of Jacob, come, let us walk in the light of our Father. Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
6 For you have abandoned your people, the house of Jacob, because they are filled with influences from the east and with fortune-tellers like the Philistines, and they have made alliances with foreigners. Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7 Their land is full of silver and gold, with no end to their treasures; their land is full of horses, with no end to their chariots. Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8 Their land is full of idols; they bow down to the work of their hands, to what their own fingers have made. Ala ha jupụtara nʼarụsị, ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ, ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9 So mankind is brought low, and everyone is humbled—do not forgive them. Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala, meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala. Ya mere, agbagharala ha.
10 Go into the rocks and hide in the dust from the dread of our Father and from the splendor of his majesty. Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11 The proud eyes of mankind will be brought low, and the arrogance of men will be humbled; our Father alone will be exalted in that day. Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12 For the Father of heaven's armies has a day in store against all that is proud and lofty, against all that is lifted up, so that it will be brought low, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala),
13 against all the cedars of Lebanon, lofty and lifted up, and against all the oaks of Bashan, nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan,
14 against all the high mountains and against all the lofty hills, nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,
15 against every high tower and against every fortified wall, nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
16 against all the ships of Tarshish and against every magnificent vessel. nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17 The arrogance of mankind will be humbled, and the pride of men brought low; our Father alone will be exalted in that day, Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18 and the idols will completely vanish. A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19 People will flee into the caves of the rocks and into holes in the ground from the dread of our Father and from the splendor of his majesty, when he rises to shake the earth. Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20 In that day people will throw away their idols of silver and their idols of gold to the moles and bats, which they made for themselves to worship. Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21 They will go into the clefts of the rocks and into the crevices of the cliffs from the dread of our Father and from the splendor of his majesty, when he rises to shake the earth. Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22 Stop trusting in mere man, who has only breath in his nostrils. What good is he? Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]